8 Jehova gwakwara Erọn, sị: “M meela gị onye na-ahụ maka onyinye ndị a na-enye m.+ Enyela m gị na ụmụ gị ndị nwoke ụfọdụ n’ime ihe niile dị nsọ ndị Izrel na-enye n’onyinye ka ha bụrụ òkè a ga na-enye unu mgbe niile.+
19 Enyela m gị na ụmụ gị ndị nwoke na ụmụ gị ndị nwaanyị onyinye niile dị nsọ ndị Izrel ga na-enye Jehova+ ka ọ bụrụ òkè unu mgbe niile.+ Ọ ga-abụrụ gị na ụmụ gị ọgbụgba ndụ ga-adịte aka* n’ihu Jehova.”