-
Ọnụ Ọgụgụ 31:28, 29Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
28 Ka ndị agha ahụ gara agha kpọnye gị otu onye* n’ime narị mmadụ ise (500) ọ bụla, kpụnyekwa gị otu ehi n’ime narị ehi ise (500) ọ bụla, otu jakị n’ime narị jakị ise (500) ọ bụla, otu ewu ma ọ bụ atụrụ n’ime narị ewu na atụrụ ise (500) ọ bụla, ka ha bụrụ ụtụ a ga-atụrụ Jehova. 29 Unu ga-esi n’ihe ha ketara were ya nye Elieza onye nchụàjà ka ọ bụrụ onyinye e nyere Jehova.+
-