-
Levitikọs 22:4-6Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
4 Nwoke ọ bụla bụ́ nwa Erọn nke na-arịa ekpenta+ ma ọ bụ nke ihe na-agbapụta n’ahụ́+ agaghị eri ihe dị nsọ ruo mgbe ọ dịrị ọcha.+ E nweghị nwoke ga-eri ya ma ọ bụrụ na o metụrụ onye na-adịghị ọcha aka, ya bụ, onye na-adịghị ọcha maka na o metụrụ onye nwụrụ anwụ*+ aka. Nwoke ọbara ọcha na-agbapụta n’ahụ́ agaghịkwa eri ya.+ 5 Nwoke metụrụ obere anụmanụ* na-adịghị ọcha aka+ ma ọ bụ nwoke metụrụ onye na-adịghị ọcha aka bụ́ onye nwere ike ime ka ọ ghara ịdị ọcha agaghịkwa eri ya.+ 6 Onye* ọ bụla metụrụ ihe ọ bụla n’ime ha aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede. Onye ahụ agaghịkwa eri ihe ọ bụla dị nsọ, kama ọ ga-eji mmiri saa ahụ́.+
-