-
Ọnụ Ọgụgụ 10:11-13Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
11 N’afọ nke abụọ, n’abalị iri abụọ n’ọnwa nke abụọ,+ ígwé ojii ahụ si n’elu ụlọikwuu igbe ọgbụgba ndụ dị na ya* pụọ.+ 12 Ndị Izrel wee malite ịpụ n’ala ịkpa Saịnaị otú e nyere ha iwu ka ha si na-akwali mgbe ha na-akwaga ebe ọzọ.+ Ígwé ojii ahụ kwụsịrị n’ala ịkpa Peran.+ 13 Ihe a bụ nke mbụ ha kwaliri kemgbe Jehova si n’ọnụ Mosis nye ha ntụziaka otú ha ga-esi na-akwali.+
-