26 Werezie okpuru afọ* ebule ahụ e ji ahọpụta ndị nchụàjà,+ bụ́ nke a chụrụ n’àjà maka Erọn, ma fegharịa ya ka ọ bụrụ àjà a na-efegharị efegharị n’ihu Jehova. Ọ ga-abụzi òkè gị.
34 N’ihi na m na-anara ndị Izrel okpuru afọ* anụ e ji chụọ àjà a na-efegharị efegharị nakwa ụkwụ anụ bụ́ òkè dị nsọ nke si n’àjà udo ha. M na-ewerekwa ha nye Erọn onye nchụàjà na ụmụ ya ndị nwoke ka ọ bụrụ iwu ga-adịgide adịgide ndị Izrel ga na-edebe.+