52 “Onye Izrel ọ bụla ga-ama ụlọikwuu ya n’ebe e kenyere ya. Nwoke ọ bụla ga-ama ụlọikwuu ya n’ebe ìgwè ebo atọ nke ebo ya so na ya mara ụlọikwuu,+ n’ìgwè ha n’ìgwè ha.
2 “Ndị Izrel ga-ama ụlọikwuu ha n’ebe ìgwè ebo atọ+ nke ebo ha so na ya mara ụlọikwuu. Nwoke ọ bụla ga-ama ụlọikwuu ya n’ebe dị nso n’ebe e nwere ihe àmà na-egosi ọnụmara o si. Ha ga-ama ụlọikwuu ha gburugburu ụlọikwuu nzute, cheekwa ya ihu.