2 M ga-eme ka ị bụrụ nnukwu mba. M ga-agọzi gị. M ga-eme ka aha gị na-ede ude, a ga-esikwa n’aka gị gọzie ndị mmadụ.+3 M ga-agọzi ndị na-agọzi gị. M ga-abụ onye na-akpọ gị iyi ọnụ,+ a ga-esikwa n’aka gị gọzie ezinụlọ niile dị n’ụwa.”+
43 biko, nọrọ n’eluigwe ebe i bi nụ ekpere ya,+ meekwara ya ihe niile ọ na-arịọ gị, ka ndị niile nọ n’ụwa wee mara aha gị, na-atụkwa egwu gị+ otú ndị Izrel bụ́ ndị gị na-eme, ka ha wee marakwa na m rụrụ ụlọ a ka a nọrọ na-eto aha gị.