23 Jehova wee gwa Mosis na Erọn okwu n’Ugwu Họọ, n’akụkụ ókè nke ala Ịdọm, sị: 24 “Erọn ga-anwụ, a ga-elikwa ya otú e liri ndị nna nna ya.+ Ọ gaghị aba n’ala m ga-enye ndị Izrel n’ihi na unu abụọ nupụrụ isi n’iwu m nyere banyere mmiri Meriba.+
38 Erọn onye nchụàjà wee gbagoo n’Ugwu Họọ otú Jehova nyere ya n’iwu. Ọ nwụrụ n’ebe ahụ n’afọ nke iri anọ ndị Izrel pụtachara n’Ijipt, n’abalị mbụ n’ọnwa nke ise.+