-
Levitikọs 11:2-4Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
2 “Gwanụ ndị Izrel, sị, ‘Ihe a bụ anụmanụ ndị unu nwere ike iri+ n’ime anụmanụ ndị na-agagharị n’ala: 3 Unu nwere ike iri anụmanụ ọ bụla na-atagharị ọnụ, nke ọbụ ụkwụ ya kebiri abụọ, gbawaakwa n’etiti.
4 “‘Ma unu agaghị eri anụmanụ ndị a n’ime anụmanụ ndị na-atagharị ọnụ ma ọ bụ ndị ọbụ ụkwụ ha kebiri abụọ: kamel bụ́ anụ na-atagharị ọnụ ma ọbụ ụkwụ ya ekebighị abụọ. Ọ bụụrụ unu anụ na-adịghị ọcha.+
-