25 Unu ga-akpọ arụsị ha a pịrị apị, bụ́ ndị ha ji mere chi, ọkụ.+ Agụụ ọlaọcha na ọlaedo dị n’arụsị ndị ahụ agụla unu.+ Unu ewerekwala ha, ka ha ghara ịbụrụ unu ọnyà, n’ihi na ọ bụ arụ n’anya Jehova bụ́ Chineke unu.+
6 Ndị Izrel malitere ọzọ ime ihe dị njọ n’anya Jehova.+ Ha malitekwara ife Bel,+ Ashtọret, chi ndị Eram,* chi ndị Saịdọn, chi ndị Moab,+ chi ndị Amọn,+ na chi ndị Filistia.+ Ha hapụrụ Jehova, ha efeghịkwa ya.