-
Ndị Ikpe 3:9, 10Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
9 Mgbe ndị Izrel rịọrọ Jehova ka o nyere ha aka,+ Jehova nyere ndị Izrel onye nzọpụta ka ọ napụta ha,+ ya bụ, Ọtniel+ nwa Kinaz, nwanne Keleb nke Keleb tọrọ. 10 Jehova wụkwasịrị ya mmụọ ya,+ o wee bụrụ onyeikpe Izrel. Mgbe ọ gara agha, Jehova nyefere Kushan-rishateyim eze Mesopotemia* n’aka ya, ya emerie Kushan-rishateyim.
-