5 Akpọrọla ha isiala, ekwekwala ka a rata gị ka i fee ha ofufe,+ n’ihi na mụnwa bụ́ Jehova Chineke gị bụ Chineke nke chọrọ ka a na-efe naanị ya ofufe.+ M na-ata ụmụ ndị kpọrọ m asị ahụhụ, na-atakwa ọgbọ ha nke atọ nakwa ọgbọ ha nke anọ ahụhụ n’ihi mmehie ndị nna ha.
15 Ugbu a, ọ bụrụ na ife Jehova adịghị unu mma, họrọnụ taa onye unu ga-efe,+ ma ọ̀ bụ chi niile nna nna unu hà fere n’ebe ọwụwa anyanwụ Osimiri Yufretis,+ ma ọ̀ bụ chi niile nke ndị Amọraịt, ndị unu bi n’ala ha.+ Ma, mụ na ezinụlọ m ga-efe Jehova.”
3 Samuel wee gwa ndị Izrel niile, sị: “Ọ bụrụ na unu ji obi unu niile na-alọghachikwute Jehova,+ wepụnụ chi ndị mba ọzọ+ na Ashtọret+ dị ebe unu nọ. Ka obi unu niile dịrị ebe Jehova nọ, na-efekwanụ naanị ya.+ Ọ ga-anapụtakwa unu n’aka ndị Filistia.”+