-
2 Ihe E Mere 28:5, 6Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
5 Jehova Chineke ya wee nyefee ya n’aka eze Siria,+ ya emerie ya, dọrọkwa ọtụtụ n’ime ndị ya n’agha laa Damaskọs.+ Chineke nyefekwara ya n’aka eze Izrel, ya asụọ ya na ndị obodo ya akwụ. 6 N’otu ụbọchị, Pika+ nwa Remalaya batara na Juda gbuo otu narị puku mmadụ na puku iri abụọ (120,000). Ha niile bụkwa ndị dike. O gburu ha n’ihi na ha hapụrụ Jehova bụ́ Chineke ndị nna nna ha.+
-