-
Joshụa 21:20-26Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
20 E fekwara nza, si n’ebo Ifrem nye ndị fọrọ n’ezinụlọ ụmụ Kohat, bụ́ ndị Livaị, obodo ụfọdụ. 21 Ha nyere ha obodo onye gburu mmadụ ga-agbaba.+ Ha nyere ha Shikem+ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, nke dị n’ala Ifrem bụ́ ugwu ugwu, Giza+ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, 22 Kibzeyim na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, nakwa Bet-horọn+ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa. Ha dị obodo anọ.
23 E sikwa n’ebo Dan nye ha Elteke na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, Gibetọn na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, 24 Aịjalọn+ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, nakwa Gat-rimọn na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa. Ha dị obodo anọ.
25 E sikwa n’ọkara ebo Manase nye ha Teanak+ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa nakwa Gat-rimọn na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa. Ha dị obodo abụọ.
26 Obodo niile na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa ndị ezinụlọ ụmụ Kohat fọrọnụ nwetara dị iri.
-