-
2 Ihe E Mere 16:13, 14Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
13 N’ikpeazụ, Esa nwụrụ otú nna nna ya hà nwụrụ.+ Ọ nwụrụ n’afọ nke iri anọ na otu n’ọchịchị ya. 14 E liri ya ná nnukwu ili o gwuuru onwe ya n’Obodo Devid.+ E nyiwere ya n’àkwà* ihe juru na ya bụ mmanụ balsam na ụdị mmanụ otite dị iche iche a gwara n’ụdị pụrụ iche.+ Ha mụnyekwara ọtụtụ ihe na-esi ísì ọma ọkụ iji kwanyere ya ùgwù n’oge a na-eli ya.
-
-
Jeremaya 34:4, 5Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
4 Ma, Zedekaya eze Juda, gee ntị n’ihe Jehova kwuru, ‘Jehova kwuru gbasara gị, sị: “A gaghị eji mma agha gbuo gị. 5 Ị ga-anwụ n’udo.+ Ndị gị ga-amụrụ gị insens* otú ha mụụrụ nna nna gị hà, bụ́ ndị eze bu gị ụzọ. Ha ga-erukwara gị uju, sị, ‘Ewoo, nna anyị ukwu!’ n’ihi na ‘ekwuola m ya.’ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.”’”’”
-