29 N’oge Pika na-achị Izrel, Tiglat-piliza+ eze Asiria lụsoro obodo ụfọdụ agha ma weghara ha. Obodo ndị ahụ bụ Aịjọn, Ebel-bet-meaka,+ Janoa, Kidesh,+ Hezọ, Gilied,+ na Galili, ya bụ, obodo Naftalaị niile.+ Ọ dọkwaara ndị bi n’obodo ndị a n’agha laa Asiria.+
26 N’ihi ya, Chineke Izrel mere ka Pul, eze Asiria,+ (ya bụ, Tilgat-pilniza,+ eze Asiria), gaa dọrọ ebo Ruben, ebo Gad, na ọkara ebo Manase n’agha ma kpọga ha Hela, Hebọ, Hera, nakwa n’akụkụ osimiri Gozan,+ ha ebiri ebe ahụ ruo taa.
20 Tilgat-pilniza+ eze Asiria mechakwara bịa lụso Ehaz agha, taakwa ya ahụhụ+ kama inyere ya aka. 21 O nwere oge Ehaz kwakọọrọ ihe niile dị n’ụlọ Jehova na n’ụlọ* eze+ nakwa n’ụlọ ndị isi, jiri ha nye eze Asiria onyinye. Ma ihe a o mere enyereghị ya aka.