Abụ Ọma 27:11 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 11 Jehova, biko, kụziere m ụzọ gị.+ Duo m n’ụzọ ziri ezi n’ihi ndị iro m. Abụ Ọma 119:33 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 33 Jehova, biko, kụziere m+ otú m ga-esi na-eso ntụziaka gị,M ga-esokwa ya ruo n’isi.+ Abụ Ọma 143:8 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 8 Mee ka m nụ banyere ịhụnanya gị n’ụtụtụ,N’ihi na m tụkwasịrị gị obi. Mee ka m mara ụzọ m kwesịrị ịna-eso,+N’ihi na ọ bụ gị ka m lekwasịrị anya. Aịzaya 54:13 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 13 Jehova ga na-akụziri ụmụ gị niile ihe.+ Ụmụ gị ga-anọkwa nnọọ n’udo.+
8 Mee ka m nụ banyere ịhụnanya gị n’ụtụtụ,N’ihi na m tụkwasịrị gị obi. Mee ka m mara ụzọ m kwesịrị ịna-eso,+N’ihi na ọ bụ gị ka m lekwasịrị anya.