Ọpụpụ 19:16 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 16 N’ụtụtụ ụbọchị nke atọ, égbè eluigwe gbawara, àmụ̀mà ana-egbukwa, ígwé ojii+ kpuchikwara ugwu ahụ, a nụwakwara ụda opi na-adasi ike. Ndị Izrel niile nọ n’ebe ha mara ụlọikwuu wee malite ịma jijiji.+ Ọpụpụ 19:18 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 18 Ugwu Saịnaị niile kwụrụ anwụrụ ọkụ n’ihi na Jehova ji ọkụ gbadata na ya.+ Anwụrụ ọkụ sikwa na ya na-akwụgo elu ka anwụrụ ọkụ si ná nnukwu ekwú, ugwu ahụ niile nọkwa na-amasi jijiji ike.+ Abụ Ọma 77:18 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 18 Ụda égbè eluigwe gị+ dị ka mkpọtụ ụkwụ ụgbọ ịnyịnya na-eme. Àmụ̀mà gburu, ìhè enwuo n’ụwa.*+ Ụwa mere mkpọtụ, maakwa jijiji.+ Abụ Ọma 104:32 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 32 O lee ụwa anya, ụwa amaa jijiji. O metụ ugwu dị iche iche aka, ha akwụọ anwụrụ ọkụ.+
16 N’ụtụtụ ụbọchị nke atọ, égbè eluigwe gbawara, àmụ̀mà ana-egbukwa, ígwé ojii+ kpuchikwara ugwu ahụ, a nụwakwara ụda opi na-adasi ike. Ndị Izrel niile nọ n’ebe ha mara ụlọikwuu wee malite ịma jijiji.+
18 Ugwu Saịnaị niile kwụrụ anwụrụ ọkụ n’ihi na Jehova ji ọkụ gbadata na ya.+ Anwụrụ ọkụ sikwa na ya na-akwụgo elu ka anwụrụ ọkụ si ná nnukwu ekwú, ugwu ahụ niile nọkwa na-amasi jijiji ike.+
18 Ụda égbè eluigwe gị+ dị ka mkpọtụ ụkwụ ụgbọ ịnyịnya na-eme. Àmụ̀mà gburu, ìhè enwuo n’ụwa.*+ Ụwa mere mkpọtụ, maakwa jijiji.+