-
Ndị Hibru 5:5, 6Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
5 Otú ahụ ka ọ dịkwa Kraịst. O toghị onwe ya+ ma jiri aka ya họpụta onwe ya ka ọ bụrụ nnukwu onye nchụàjà, kama ọ bụ Onye nyere ya otuto gwara ya, sị: “Ị bụ ọkpara m. Abụrụla m nna gị taa.”+ 6 Dịkwa ka o kwuru n’ebe ọzọ, sị: “Ị bụ onye nchụàjà dị ka Melkizedek, ị ga-abụkwa onye nchụàjà ruo mgbe ebighị ebi.”+
-
-
Ndị Hibru 6:19, 20Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
19 Olileanya a anyị nwere+ ji ndụ* anyị otú nko e ji ejide ụgbọ mmiri* si ejide ụgbọ mmiri. O siri ike, e jikwa ya n’aka. Ọ na-edu anyị agafe ákwà mgbochi ahụ,+ 20 nke onye bu anyị ụzọ gaferela n’ihi anyị, ya bụ, Jizọs,+ onye ghọrọ nnukwu onye nchụàjà dị ka Melkizedek, ọ ga-abụkwa onye nchụàjà ruo mgbe ebighị ebi.+
-