Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • 1 Ndị Eze 8:25
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
    • 25 Ugbu a, Jehova bụ́ Chineke Izrel, mezuokwa nkwa a i kwere ohu gị Devid bụ́ nna m. I kwere ya nkwa, sị: ‘Ọ bụrụhaala na ụmụ gị ejisie ike na-edebe iwu m otú gịnwa debere, ọ dịghị mgbe a na-agaghị enwe onye si n’ezinụlọ gị ga-anọ n’ocheeze Izrel.’+

  • Abụ Ọma 89:3, 4
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
    •  3 Ị sịrị: “Mụ na onye m họọrọ agbaala ndụ.+

      M ṅụọrọla ohu m Devid iyi,+ sị:

       4 ‘M ga-eme ka nwa* gị+ nọruo mgbe ebighị ebi,

      M ga-emekwa ka ocheeze gị dịrị n’ọgbọ niile.’”+ (Sila)

  • Abụ Ọma 89:20
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
    • 20 Ahọrọla m Devid ohu m.+

      Ejirila m mmanụ m dị nsọ tee ya mmanụ.+

  • Abụ Ọma 89:36
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
    • 36 Nwa* ya ga-anọru mgbe ebighị ebi.+

      Ocheeze ya ga-adị n’ihu m ruo mgbe ebighị ebi ka anyanwụ.+

  • Aịzaya 9:7
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
    •  7 Ọchịchị ya ga-eru ebe niile.

      Udo agaghịkwa akwụsị ịdị+

      N’ocheeze Devid+ nakwa n’alaeze ya.

      A ga-eme ka alaeze ya sie ike+ ma dịgide

      Malite ugbu a ruo mgbe ebighị ebi,

      N’ihi na ọ na-ekpe ikpe ziri ezi,+ na-emekwa ezi omume.+

      Jehova nke ụsụụ ndị agha ga-eji ịnụ ọkụ n’obi mee ihe a.

  • Jeremaya 33:20, 21
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
    • 20 “Mụnwa bụ́ Jehova kwuru, sị, ‘Ọ bụrụ na unu nwere ike imebi ọgbụgba ndụ m nke na-achị ehihie na ọgbụgba ndụ m nke na-achị abalị, ka a ghara inwe ehihie na abalị n’oge ha,+ 21 maranụ na e nwekwara ike imebi ọgbụgba ndụ mụ na Devid bụ́ ohu m,+ a gharazie inwe nwa ya ga-anọ n’ocheeze ya na-achị,+ nweekwa ike imebi ọgbụgba ndụ mụ na ndị Livaị bụ́ ndị nchụàjà, ndị na-ejere m ozi.+

  • Matiu 9:27
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
    • 27 Mgbe Jizọs si ebe ahụ na-apụ, ndị ìsì abụọ+ sooro ya, na-eti mkpu, sị: “Nwa Devid, meere anyị ebere.”

  • Luk 1:69
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
    • 69 O meekwala ka e nwee onye nzọpụta dị ike*+ n’ụlọ ohu ya Devid,+

  • Ọrụ Ndịozi 2:30, 31
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
    • 30 Ọ bụ onye amụma. Ọ makwa na Chineke ṅụụrụ ya iyi na ọ ga-eme ka otu n’ime ụmụ ya* nọdụ ala n’ocheeze ya.+ 31 Ọ ma na a ga-akpọlite Kraịst n’ọnwụ nakwa na a gaghị ahapụ ya n’ili,* anụ ahụ́ ya agaghịkwa ere ure.+

  • Ọrụ Ndịozi 13:22, 23
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
    • 22 Mgbe ọ kwụsịrị ya ịbụ eze, o mere ka Devid bụrụ eze ha.+ O kwuru banyere ya, sị: ‘Ahọrọla m Devid nwa Jesi,+ nwoke obi m nabatara.+ Ọ ga-eme ihe niile m na-achọ.’ 23 Chineke si n’ụmụ* nwoke a wetara Izrel onye nzọpụta bụ́ Jizọs,+ otú o kwere ná nkwa.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya