-
Ọnụ Ọgụgụ 21:33-35Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
33 Mgbe e mechara, ha tụgharịrị gbagowe n’Ụzọ E Si Aga Beshan. Ọg+ eze Beshan na ndị agha ya niile wee pụta ịlụso ha agha n’Edraị.+ 34 Jehova sịrị Mosis: “Atụla ya egwu+ n’ihi na m ga-enyefe ya na ndị agha ya niile nakwa ala ya n’aka gị.+ Ị ga-eme ya ihe i mere Saịhọn eze ndị Amọraịt, onye bibu na Heshbọn.”+ 35 Ha wee na-egbu ya na ụmụ ya ndị nwoke na ndị obodo ya niile ruo mgbe a na-enweghịzi onye obodo ya fọrọ.+ Ha wee weghara ala ya.+
-