29 Ka okwu rere ure ghara isi unu n’ọnụ pụta,+ kama, na-ekwunụ naanị okwu dị mma n’oge dabara adaba, nke ga-abara ndị nụrụ ya uru, meekwa ka okwukwe ha sikwuo ike.+
6 Ire dị ka ọkụ.+ Ọ bụ ihe dị anyị n’ahụ́, nke na-eme ihe ọjọọ, na-emerụkwa ahụ́ niile.+ O nwere ike ịla ndụ mmadụ n’iyi. Ọ dịkwa ka Gehena* n’ihi na ọ na-ala ihe n’iyi.