-
1 Timoti 6:9, 10Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
9 Ma, a ga-anwata ndị kpebisiri ike ịba ọgaranya, ha ga-amakwa n’ọnyà.+ Ihe ọjọọ ga na-agụ ha agụụ. Ha ga na-akpakwa àgwà ka ndị na-amaghị ihe. A ga-ejikwa maka ihe ndị a bibie ha, laakwa ha n’iyi.+ 10 N’ihi na ịhụ ego n’anya bụ mgbọrọgwụ ụdị ihe ọjọọ niile. O meela ka ụfọdụ ndị dapụ n’okwukwe, meekwa ka ahụ́ niile na-afụ ha ụfụ ka ndị mara onwe ha mma aghara aghara.+
-