-
Ọnụ Ọgụgụ 25:6-8Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
6 Ma n’oge ahụ, otu nwoke Izrel kpọọrọ otu nwaanyị Midian na-abata n’ebe ụmụnne ya nọ,+ n’ihu Mosis nakwa n’ihu nzukọ Izrel niile, mgbe ndị Izrel nọ na-ebe ákwá n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute. 7 Mgbe Finihas+ nwa Elieza nwa Erọn onye nchụàjà hụrụ ya, o si n’ebe ahụ ndị Izrel zukọrọ bilie ozugbo ma were ube. 8 O sochiri nwoke Izrel ahụ azụ ma banye n’ụlọikwuu ha banyere, magbuo ha abụọ. Ọ mabara nwoke Izrel ahụ na nwaanyị ahụ ube n’ahụ́, ube ahụ amaba n’ihe nke nwaanyị ahụ ji bụrụ nwaanyị. Ọrịa ọjọọ nọ na-egbu ndị Izrel wee kwụsị.+
-
-
1 Samuel 15:22, 23Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
22 Samuel asị ya: “Àjà a na-esu ọkụ na àjà ndị ọzọ hà na-amasị Jehova+ karịa irubere Jehova isi? O doro anya na ọ ka mma irube isi karịa ịchụ àjà,+ ige ntị nke ọma dịkwa mma karịa abụba+ ebule. 23 N’ihi na nnupụisi+ dị njọ otú ịgba afa dị.+ Mmadụ ime ihe a na-enyeghị ya ikike ime na mmadụ ime anwansi* nakwa mmadụ ife arụsị bụ otu ihe. Ebe ọ bụ na ị jụrụ ime ihe Jehova kwuru,+ yanwa ajụkwala gị ka ị gharazie ịbụ eze.”+
-