1 Samuel 15:22 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 22 Samuel asị ya: “Àjà a na-esu ọkụ na àjà ndị ọzọ hà na-amasị Jehova+ karịa irubere Jehova isi? O doro anya na ọ ka mma irube isi karịa ịchụ àjà,+ ige ntị nke ọma dịkwa mma karịa abụba+ ebule. Ilu 15:8 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 8 Jehova kpọrọ àjà ndị ajọ omume na-achụ asị,+Ma ekpere ndị ezi omume na-ekpe na-eme ya obi ụtọ.+ Hosia 6:6 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 6 N’ihi na ihe na-atọ m ụtọ bụ ịhụnanya,* ọ bụghị àjà. Ịmara Chineke na-atọkwa m ụtọ, ọ bụghị àjà a na-esucha ọkụ.+ Maịka 6:7 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 7 Puku kwuru puku ebule ọ̀ ga-adị Jehova mma? Mmanụ nke na-asọ ka iri puku kwuru iri puku iyi ọ̀ ga-adị ya mma?+ M̀ ga-enye ọkpara m maka isi m nupụrụ? M̀ ga-enye mkpụrụ nke afọ m maka mmehie m?*+
22 Samuel asị ya: “Àjà a na-esu ọkụ na àjà ndị ọzọ hà na-amasị Jehova+ karịa irubere Jehova isi? O doro anya na ọ ka mma irube isi karịa ịchụ àjà,+ ige ntị nke ọma dịkwa mma karịa abụba+ ebule.
6 N’ihi na ihe na-atọ m ụtọ bụ ịhụnanya,* ọ bụghị àjà. Ịmara Chineke na-atọkwa m ụtọ, ọ bụghị àjà a na-esucha ọkụ.+
7 Puku kwuru puku ebule ọ̀ ga-adị Jehova mma? Mmanụ nke na-asọ ka iri puku kwuru iri puku iyi ọ̀ ga-adị ya mma?+ M̀ ga-enye ọkpara m maka isi m nupụrụ? M̀ ga-enye mkpụrụ nke afọ m maka mmehie m?*+