-
Aịzaya 20:3, 4Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
3 Jehova kwuziri, sị: “Ahụ́ ọtọ a na ụkwụ efu a Aịzaya ohu m gba na-agagharị ruo afọ atọ bụ ihe na-egosi ihe ga-eme+ Ijipt+ na Etiopia.+ 4 Eze Asiria ga-eduru ndị Ijipt+ na ndị Etiopia a dọọrọ n’agha laa, ma ụmụaka ma ndị agadi. Ha ga-agbacha ụkwụ efu, gbarakwa ahụ́ ọtọ, a na-ahụ ikè ha anya. N’eziokwu, a ga-emenye ndị Ijipt ihere.*
-
-
Jeremaya 46:25, 26Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
25 “Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, sịrị: ‘Ugbu a, m ga-ata Emọn+ bụ́ chi ndị Noo* ahụhụ,+ taakwa Fero, ndị Ijipt, chi ha dị iche iche,+ na ndị eze ha. M ga-ata Fero na ndị niile tụkwasịrị ya obi ahụhụ.’+
26 “Jehova kwuru, sị, ‘M ga-enyefe ha n’aka ndị na-achọ igbu ha,* ya bụ, n’aka Nebukadneza* eze Babịlọn+ na ndị na-ejere ya ozi. Ma, ndị mmadụ ga-emecha biri n’Ijipt otú ha bi ya n’oge gara aga.’+
-