-
2 Ndị Eze 17:9-11Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
9 Ndị Izrel nọkwa na-eme ihe ndị na-adịghị mma n’anya Jehova bụ́ Chineke ha. Ha nọ na-arụ ebe ndị dị elu n’obodo ha niile,+ malite n’ụlọ nche ruo n’obodo a rụsiri ike.* 10 Ha nọkwa na-arụrụ onwe ha ogidi arụsị na ogwe osisi arụsị*+ n’ugwu ọ bụla nakwa n’okpuru nnukwu osisi ọ bụla na-ama pokopoko.+ 11 Ha na-anọkwa n’ebe niile dị elu na-esu àjà ọkụ otú mba ndị ọzọ na-eme, ndị Jehova ji maka ndị Izrel mee ka a dọrọ n’agha.+ Ha nọ na-eme ihe ọjọọ, na-akpasu Jehova iwe.
-
-
Ezikiel 23:4, 5Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
4 Aha nke okenye bụ Ohola,* aha nke ntakịrị abụrụ Oholiba.* Ha ghọrọ ndị nke m, mụọkwara m ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị. Ohola bụ Sameria,+ Oholiba abụrụ Jeruselem.
5 “Ohola malitekwara ịgba akwụna+ mgbe ọ bụ nke m. Ọ na-agụsi ya ike ka ya na ndị Asiria, bụ́ ndị agbata obi ya,+ ha na ya na-eme enyi, dinaa.+
-