2 N’oge ikpeazụ,
Ugwu nke ụlọ Jehova dị n’elu ya
Ga-akwụsi ike n’ebe dị elu karịa ugwu ukwu niile.+
A ga-ebulikwa ya ka ọ dị elu karịa ugwu nta niile.
Mba niile ga-enurukwa na-agbago na ya.+
3 Ọtụtụ ndị ga-ejekwa, sị:
“Bịanụ ka anyị gbagoo n’ugwu Jehova,
Gbagookwa n’ụlọ Chineke Jekọb.+
Ọ ga-akụziri anyị ụzọ ya.
Anyị ga-ejekwa ije n’ụzọ ya.”+
N’ihi na a ga-esi na Zayọn nye iwu,
Sikwa na Jeruselem kwuo ihe Jehova kwuru.+