-
Ọrụ Ndịozi 28:26, 27Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
26 sị: ‘Gaa gwa ndị a, sị: “Unu ga-anụ ihe, ma unu agaghị aghọta ihe ọ bụla. Unu ga-ele anya, ma unu agaghị ahụ ihe ọ bụla.+ 27 N’ihi na obi ndị a anaghịzi anabata ihe, ha ejirikwala ntị ha nụ ihe, ma ha emeghị ihe ọ bụla. Ha emechiekwala anya ha ka ha ghara ịhụ ụzọ, mechie ntị ha ka ha ghara ịnụ ihe ọ bụla, kpọchiekwa obi ha ka ha ghara ịghọta ihe ọ bụla, gharakwa ịgbanwe, m wee gwọọ ha.”’+
-