10 Ọ gwakwara ha, sị: “Mba ga-alụso mba ọzọ agha,+ alaeze ga-alụsokwa alaeze ọzọ agha.+ 11 A ga-enwe oké ala ọma jijiji, ụkọ nri na ọrịa na-efe efe ga-adịkwa n’ebe dị iche iche.+ A ga-ahụkwa ihe ndị na-atụ egwu, nweekwa oké ihe àmà dị iche iche n’eluigwe.