35 Jizọs wee malite ijegharị n’obodo ukwu nakwa n’obodo nta niile, na-ezi ihe n’ụlọ nzukọ ha, na-ekwusakwa ozi ọma Alaeze Chineke ma na-agwọ ụdị ọrịa ọ bụla.+
19 N’ihi ya, gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.+ Na-eme ha baptizim+ n’aha Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ. 20 Na-ezi ha ka ha debe ihe niile m nyere unu n’iwu.+ M nọnyekwaara unu ụbọchị niile ruo ọgwụgwụ oge a.”*+
6 Ahụkwara m mmụọ ozi ọzọ ka ọ na-efegharị n’etiti eluigwe.* Ọ nọ na-ezisara ndị bi n’ụwa, mba niile na ebo niile na ndị na-asụ asụsụ niile na agbụrụ niile ozi ọma ga-adịru mgbe ebighị ebi.+