-
Daniel 9:24Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
24 “Chineke ekpebiela na ọ bụ izu iri asaa* ka ndị gị nakwa obodo nsọ unu ga-anọ,+ ka e wee mee ka mmebi iwu kwụsị, ka e wee mee ka mmehie kwụsị,+ ka e wee gbaghara mmehie,+ ka e wee mee ka ezi omume dịrị ruo mgbe ebighị ebi,+ ka e wee kaa ọhụụ na amụma* akara,+ nakwa ka e wee tee Ebe Nsọ Kacha Ebe Nsọ* mmanụ.
-
-
Taịtọs 2:13, 14Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
13 Ka ọ dị ugbu a, anyị na-eche ka ihe na-eme obi ụtọ anyị na-atụ anya ya mezuo,+ na-echekwa mgbe Chineke ukwu na Onye Nzọpụta anyị, bụ́ Jizọs Kraịst, ga-eme ka ebube ha pụta ìhè. 14 Kraịst nyere ndụ ya n’ihi anyị+ ka ọ tọhapụ anyị*+ ka anyị ghara ịna-eme ụdị ihe ọ bụla bụ́ imebi iwu nakwa ka ọ sachaara onwe ya ndị pụrụ iche bụ́ ndị nke ya, ndị ji ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ọrụ dị mma.+
-