10 Ma, ụbọchị Jehova*+ ga-abịa otú onye ohi si abịa.+ N’ụbọchị ahụ, eluigwe ga-eji oké ụzụ laa n’iyi.+ Ihe ndị dị n’eluigwe na n’ụwa ga-adịkwa oké ọkụ wee gbazee. A ga-agbakwa ụwa na ọrụ ndị a rụrụ n’ime ya ọkụ.*+
15 Anụkwara m olu sịrị: “Ana m abịa ka onye ohi.+ Onye mụ anya,+ nke a na-anaraghịkwa uwe ya, ga-enwe obi ụtọ, n’ihi na ọ gaghị agba ọtọ na-ejegharị, ndị mmadụ ahụ ya, ihere emee ya.”+