34 Unu echela na m bịara ime ka udo dịrị n’ụwa. Abịara m iweta mma agha, ọ bụghị udo.+35 N’ihi na m bịara ikewa ezinụlọ. Nwoke ga na-emegide nna ya, nwa nwaanyị ana-emegide nne ya, nwunye nwa ana-emegidekwa nne di ya.+36 N’eziokwu, ndị ezinụlọ mmadụ ga-abụ ndị iro ya.