9 Ya asị: “Gaa gwa ndị a, sị:
‘Unu ga-anụ ihe ugboro ugboro,
Ma unu agaghị aghọta ya.
Unu ga-ahụkwa ihe ugboro ugboro,
Ma unu agaghị amata ihe ọ bụla.’+
10 Mee ka obi ndị a ghara ịnabata ihe,+
Ka obi ha gharakwa ịghọta ihe.+
Mee ka ntị ha kpọchie,
Ka ha gharakwa iji ntị ha nụ ihe.
Mechiekwa anya ha,
Ka ha ghara iji anya ha hụ ụzọ,
Ka ha gharakwa ịgbanwe, a gwọọ ha.”+