26 “Mgbe izu iri isii na abụọ ahụ gachara, a ga-egbu Mezaya,+ ya agbara aka.+
“Ndị agha nke onyeisi na-abịanụ ga-ebibi obodo ahụ nakwa ebe nsọ ahụ.+ A ga-ebibi ya ka* à ga-asị na ọ bụ idei mmiri bibiri ya. Ma a ga na-alụ agha ruo n’ọgwụgwụ. Ihe e kpebiri bụ mbibi.+
37 “Jeruselem, Jeruselem, nke na-egbu ndị amụma, nke na-atụkwa ndị e ziteere ya nkume,+ achọọla m ịchịkọta ụmụ gị ọtụtụ ugboro dị ka nnekwu ọkụkọ si achịkọta ụmụ ya n’okpuru nku ya, ma ị chọghị ya.+38 A hapụrụla unu ụlọ unu.*+
15 “N’ihi ya, mgbe unu hụrụ ihe arụ nke na-akpata mbibi, nke Daniel onye amụma kwuru banyere ya, ka o guzo n’ebe nsọ,+ (onye na-agụ ya, ya gbalịa ghọta ya nke ọma), 16 ka ndị nọ na Judia malite ịgbaga n’ugwu.+