-
1 Pita 5:2, 3Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
2 Ebe unu bụ ndị nlekọta, na-azụnụ ìgwè atụrụ Chineke+ ndị e nyefere unu n’aka ka unu na-elekọta. Unu azụla ha ka à manyere unu amanye, kama jirinụ obi unu niile na-azụ ha otú ga-amasị Chineke.+ Unu azụkwala ha ka unu rigbuo ha,+ kama ka ịzụ ha na-anụ unu ọkụ n’obi. 3 Unu emekwala ka ọ̀ bụ unu nwe ndị Chineke,+ kama na-akpanụ àgwà ìgwè atụrụ Chineke ga na-eṅomi.+
-