-
1 Timoti 3:1-7Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
3 E kwesịrị ịtụkwasị okwu a obi: Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-agbalị ka o ruo eruo ịbụ onye nlekọta,+ ịrụ ezigbo ọrụ na-agụ ya. 2 Onye nlekọta kwesịrị ịbụ onye ndị mmadụ na-agaghị enwe ihe ha ga-eji kwujọọ ya, di otu nwaanyị, onye na-emeru ihe n’ókè, onye na-ele ihe anya otú dị mma,*+ onye na-eme ihe n’usoro, onye na-ele ọbịa,+ onye ruru eru ịkụzi ihe.+ 3 O kwesịghị ịbụ onye aṅụrụma,+ onye tigbuo zọgbuo,* onye okwu na ụka,+ ma ọ bụ onye hụrụ ego n’anya.+ Kama, o kwesịrị ịbụ onye na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị,+ 4 onye na-elekọta ezinụlọ ya nke ọma, onye ụmụ ya na-akpa àgwà ọma, na-erubekwara ya isi.+ 5 (N’ihi na ọ bụrụ na mmadụ amaghị otú ọ ga-esi na-elekọta ezinụlọ ya, oleezi otú ọ ga-esi na-elekọta ọgbakọ Chineke?) 6 O kwesịghị ịbụ onye chegharịrị ọhụrụ,+ ka ọ ghara ịdị mpako, a maa ya otu ikpe ahụ a mara Ekwensu. 7 O kwesịkwara ịbụ onye ndị na-anọghị n’ọgbakọ na-ekwu okwu ọma gbasara ya,+ ka ndị mmadụ ghara ịkọcha ya,* ya adaba n’ọnyà Ekwensu.
-
-
Taịtọs 1:5-9Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
5 M hapụrụ gị na Krit ka i dozie ihe ndị e kwesịrị idozi edozi* nakwa ka ị họpụta ndị okenye n’obodo dị iche iche, otú m gwara gị: 6 okenye ọgbakọ kwesịrị ịbụ onye a na-anaghị ebo ebubo, di otu nwaanyị, onye nwere ụmụ kwere ekwe ndị a na-anaghị ekwu na ha na-ebi ndụ ọjọọ ma ọ bụ na-eme isi ike.+ 7 Ebe ọ bụ na onye nlekọta bụ onye na-ejere Chineke ozi, o kwesịghị ịbụ onye a na-ebo ebubo, ekwe ekwe,+ onye na-ewe iwe ọsọ ọsọ,+ onye aṅụrụma, onye na-eti mmadụ ihe, onye ji anyaukwu achọ ihe ga-abara naanị ya uru, 8 kama o kwesịrị ịbụ onye na-ele ọbịa,+ onye hụrụ ihe ọma n’anya, onye na-ele ihe anya otú dị mma,+ onye ezi omume, onye jisiri Chineke aka ike,+ onye na-ejide onwe ya,+ 9 onye si n’otú o si akụzi ihe egosi na o jidesiri okwu nke eziokwu* aka ike,+ ka o nwee ike iji ihe dị mma* ọ na-akụzi na-agba ndị mmadụ ume,+ na-adọkwa ndị na-ekwugide nkụzi dị mma aka ná ntị.+
-