-
1 Pita 2:9, 10Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
9 Ma unu bụ “ndị a họọrọ, ndị eze bụ́kwa ndị nchụàjà, mba dị nsọ,+ ndị pụrụ iche Chineke họọrọ,+ ka unu wee kwusaa n’ebe niile na Chineke dị mma.”+ Ọ kpọpụtara unu n’ọchịchịrị ma kpọba unu n’ìhè ya dị ebube.+ 10 N’ihi na o nwere mgbe unu na-abụghị ndị Chineke, ma ugbu a, unu bụ ndị ya.+ Unu bụbu ndị Chineke na-emereghị ebere, ma ugbu a, o meerela unu ebere.+
-