28 Mmụọ nsọ+ enyerela anyị aka ikpebi na a gaghị ebo unu ibu arọ, ma e wezụga ihe ndị a dị mkpa: 29 ka unu jụ ihe ọ bụla gbasara ikpere arụsị,+ ghara iri ọbara,+ ghara iri anụ a nyagburu anyagbu,+ gharakwa ịkwa iko.+ Ọ bụrụ na unu elezie anya jụ ihe ndị a, ọ ga-adịrị unu mma. Nọrọnụ nke ọma.”