-
Jenesis 39:7-9Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
7 Mgbe ihe ndị a mechara, nwunye nna ukwu Josef malitere ile Josef anya, na-asị ya: “Ka mụ na gị dinaa.” 8 Ma Josef jụrụ, ọ gwakwara nwunye nna ya ukwu, sị: “Lee, nna m ukwu amaghị ihe ndị dị n’aka m n’ụlọ a. O nyefeekwala m ihe niile o nwere ka m lekọtawa. 9 E nweghị onye karịrị m n’ụlọ a. O nyefere ihe niile n’aka m ma e wepụ gị maka na ị bụ nwunye ya. Gịnịzi mere m ga-eji eme ihe a jọgburu onwe ya ma mehie Chineke?”+
-
-
1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
9 Ka ọ̀ bụ na unu amaghị na ndị ajọ omume agaghị eketa Alaeze Chineke?+ Unu ekwela ka e duhie unu. Ndị na-akwa iko,*+ ndị na-ekpere arụsị,+ ndị di ma ọ bụ ndị nwunye na-akwa iko,+ ndị na-ekwe ka ụmụ nwoke ibe ha dinaa ha,+ ndị na-edina ụmụ nwoke ibe ha,*+ 10 ndị ohi, ndị anyaukwu,+ ndị aṅụrụma,+ ndị na-ekwujọ mmadụ,* nakwa ndị na-apụnara mmadụ ihe, agaghị eketa Alaeze Chineke.+
-