5 Otú ahụ ka ụmụ nwaanyị ndị dị nsọ n’oge ochie, ndị tụkwasịrị Chineke obi, si chọọ onwe ha mma, na-erubekwara ndị di ha isi. 6 Otú ahụ ka Sera si na-erubere Ebreham isi, na-akpọkwa ya “onyenwe m.”+ Unu bụ ụmụ Sera ma ọ bụrụhaala na unu ana-eme ihe dị mma, gharakwa ịtụ egwu.+