-
Ndị Kọlọsi 1:25-27Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
25 M na-ejere ndị Chineke ozi n’ihi na ọ họpụtara m maka ozi a.+ Ọ bụkwa maka ọdịmma unu. Ọ bụ ya mere m ji na-eji ike m niile ekwusa okwu Chineke. 26 Ozi a m na-ezisa bụ ihe nzuzo dị nsọ+ e zoro kemgbe ụwa,*+ e meghịkwa ka ọgbọ ndị gara aga mara gbasara ya. Ma ugbu a, e meela ka ndị nsọ mara ya.+ 27 Ọ masịrị Chineke ime ka ndị mba ọzọ bụ́ ndị nsọ mara ihe nzuzo a dị nsọ,+ nke bụ́ akụ̀ dị ebube. Unu nwere olileanya ịdị ebube ka Kraịst+ n’ihi na unu na ya dị n’otu.
-