25 Mgbe ha richara nri anyasị,* o buuru iko, meekwa otu ihe ahụ.+ Ọ sịrị: “Iko a pụtara ọgbụgba ndụ ọhụrụ+ nke ga-enwe isi mgbe m wụpụrụ ọbara m.+ N’oge niile unu na-aṅụ ihe dị n’ime iko a, na-emenụ ya iji na-echeta m.”+
15 Ọ bụ ya mere o ji bụrụ onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ,+ ka e wee kwe ndị a kpọrọ nkwa na ha ga-enweta ngọzi* na-adịru mgbe ebighị ebi.+ Ihe niile a nwere isi n’ihi ọnwụ ya nke e si na ya gbapụta ha+ ma tọhapụ ha ná mmehie ndị ha na-eme n’ọgbụgba ndụ mbụ ahụ.