27 O bukwaara iko, kelee Chineke, bunyekwa ha ya, sị: “Unu niile, ṅụọnụ ihe dị na ya,+28 n’ihi na nke a pụtara ọbara m,+ bụ́ ‘ọbara ọgbụgba ndụ’+ nke a ga-awụpụ ka e wee gbaghara ọtụtụ ndị+ mmehie ha.+
25 Mgbe ha richara nri anyasị,* o buuru iko, meekwa otu ihe ahụ.+ Ọ sịrị: “Iko a pụtara ọgbụgba ndụ ọhụrụ+ nke ga-enwe isi mgbe m wụpụrụ ọbara m.+ N’oge niile unu na-aṅụ ihe dị n’ime iko a, na-emenụ ya iji na-echeta m.”+
6 Ma ugbu a, e nyela Jizọs ozi ka nnọọ mma* n’ihi na ọ bụkwa onye ogbugbo+ nke ọgbụgba ndụ ka mma.+ Iwu Chineke kwadoro ọgbụgba ndụ a, o hiwekwara isi ná nkwa ndị ka mma.+
15 Ọ bụ ya mere o ji bụrụ onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ,+ ka e wee kwe ndị a kpọrọ nkwa na ha ga-enweta ngọzi* na-adịru mgbe ebighị ebi.+ Ihe niile a nwere isi n’ihi ọnwụ ya nke e si na ya gbapụta ha+ ma tọhapụ ha ná mmehie ndị ha na-eme n’ọgbụgba ndụ mbụ ahụ.