6 Gee ntị! E nwere onye sị: “Maa ọkwa!”
Onye ọzọ ajụọ ya, sị: “Gịnị ka m ga-ama n’ọkwa?”
“Mmadụ niile bụ ahịhịa ndụ.
Ịhụnanya ha niile dị ka ifuru ahịhịa.+
7 Ahịhịa ndụ na-akpọnwụ akpọnwụ,
Okooko ya na-achanwụkwa achanwụ,+
N’ihi na Jehova na-ekusa ya ume.+
N’eziokwu, ndị mmadụ bụ ahịhịa ndụ.
8 Ahịhịa ndụ na-akpọnwụ akpọnwụ,
Okooko ya na-achanwụkwa achanwụ,
Ma, okwu Chineke anyị na-adịru mgbe ebighị ebi.”+