8 Nke ọ bụla n’ime ndị mmụọ ozi anọ ahụ* nwere nku isii. Nku ha niile bụkwa anya anya.+ Ehihie na abalị, ha na-asị: “Nsọ, nsọ, nsọ ka Jehova* Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, dị.+ Ọ bụ onye dịbu adị na onye dị adị na onye na-abịa.”+
17 sị: “Anyị na-ekele gị, Jehova* Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, onye dị adị+ na onye dịbu adị, n’ihi na i jirila ike gị dị ukwuu bụrụ eze ma na-achị.+