10 Ndị mmadụ chere na anyị na-eru uju, ma anyị na-aṅụrị ọṅụ mgbe niile. Ha chere na anyị dara ogbenye, ma anyị na-eme ọtụtụ ndị ọgaranya. Ha chekwara na anyị enweghị ihe ọ bụla, ma anyị nwere ihe niile.+
18 Gwakwa ha ka ha na-eme ihe ọma, na-arụ ọtụtụ ọrụ ọma, na-emesapụ aka, na-enyekwa ndị ọzọ ihe.+19 Ha ga-esi otú ahụ na-akpakọta akụ̀ n’ebe Chineke nọ, na-atọkwa ezigbo ntọala maka ọdịnihu,+ ka ha nwee ike ijidesi ndụ nke bụ́ ezigbo ndụ aka ike.+
5 Ụmụnna m m hụrụ n’anya, geenụ ntị. Ọ̀ bụ na Chineke ahọrọghị ndị ụwa weere na ha dara ogbenye ka ha bụrụ ndị bara ọgaranya n’okwukwe?+ N’eziokwu, ọ bụ ha ka ọ họọrọ ka ha keta Alaeze ya, nke o kwere nkwa inye ndị hụrụ ya n’anya.+