Abụ Ọma
Maka onye na-eduzi abụ. Abụ Devid.
31 Jehova, agbabala m n’ime gị.+
Biko, ekwela ka ihere mee m.+
Napụta m n’ihi na ị bụ onye ezi omume.+
Bịa ọsọ ọsọ napụta m.+
Bụrụ ugwu m na-agbaba na ya,
Ebe a rụsiri ike m na-agbaba ka a zọpụta m.+
3 N’ihi na ị bụ nkume m dị elu na ebe m a rụsiri ike.+
N’ihi aha gị,+ ị ga na-edu m ma na-ezi m ụzọ m ga-eso.+
5 M na-enyefe mmụọ m n’aka gị.+
Ị napụtala m, Jehova Chineke, onye eziokwu.*+
6 M kpọrọ ndị na-efe arụsị efu na-abaghị uru asị.
Ma, ọ bụ Jehova ka m tụkwasịrị obi.
Ị ma na m na-atagbu onwe m n’ahụhụ.
9 Jehova, biko meere m amara n’ihi na m na-ahụsi anya.
Uju m na-eru emeela ka anya m gharazie ịna-ahụcha ụzọ,+ meekwa ka ike gwụchaa m.+
Ike na-agwụ m n’ihi mmehie ndị m mere.
Ọkpụkpụ m esighịzi ike.+
Ndị mụ na ha dị ná mma na-atụ m ụjọ.
Ha hụ m n’èzí, ha agbawa ọsọ.+
12 Obi* ha apụọla n’ebe m nọ. Ha echefuola m ka à ga-asị na mụ anwụọla.
Adị m ka arịa kụwara akụwa.
13 Anụla m ọtụtụ ihe ọjọọ ndị mmadụ na-ekwu.
Ụjọ zuru m ahụ́.+
14 Ma, Jehova, m tụkwasịrị gị obi.+
Ana m asị: “Ị bụ Chineke m.”+
15 Ndụ m dị gị n’aka.
Napụta m n’aka ndị iro m nakwa n’aka ndị na-akpagbu m.+
Zọpụta m n’ihi ịhụnanya gị.*
17 Jehova, biko, ekwela ka ihere mee m mgbe m na-akpọku gị.+
Ka ihere mee ndị ajọ omume.+
18 Ka ndị na-ekwu okwu ụgha daa ogbi,+
Ya bụ, ndị mpako na ịkpọ asị mere ka ha na-ekwutọ onye ezi omume.
19 Ihe ọma ị na-eme karịrị akarị.+
I doweere ya ndị na-atụ egwu gị,+
Ọ bụkwa n’ihu mmadụ niile ka ị na-emere ya ndị na-agbaba n’ime gị.+
Ị ga-ezo ha n’ụlọ gị
Ka ha ghara ịba n’aka ndị na-ekwu okwu ọjọọ.+
21 Ka e too Jehova,
N’ihi otú na-enweghị atụ o si gosi na ọ hụrụ m n’anya*+ mgbe m nọ n’obodo ndị agha nọchibidoro.+
22 Ma ụjọ tụrụ m, m wee sị:
“A ga-ebibi m ka m ghara ịnọkwa n’ihu gị.”+
Ma ị nụrụ arịrịọ m mgbe m besaara gị ákwá ka i nyere m aka.+