Ekliziastis
2 Oge a ga-amụ mmadụ na oge mmadụ ga-anwụ;
Oge ịkụ ihe na oge ifopụ ihe a kụrụ;
3 Oge igbu egbu na oge ịgwọ agwọ;
Oge ịkwatu ihe na oge ịrụ ihe;
4 Oge ibe ákwá na oge ịchị ọchị;
Oge ibe ákwá arịrị na oge ịgba egwú;*
5 Oge ịtụfusị nkume na oge ịtụtụkọta nkume;
Oge ịmakụ mmadụ na oge a na-agaghị amakụ mmadụ;
6 Oge ịchọ ihe na oge iwere na ihe efuola;
Oge idowe ihe na oge ịtụfu ihe;
7 Oge ịdọka ihe+ na oge ịdụkọta ihe;
Oge ịgbachi nkịtị+ na oge ikwu okwu;+
8 Oge ịhụ mmadụ n’anya na oge ịkpọ mmadụ asị;+
Oge agha na oge udo.
9 Olee uru onye ọrụ na-erite ná mbọ niile ọ na-agba?+ 10 Ahụla m ọrụ Chineke nyere ndị mmadụ ka ha na-arụ. 11 O mere ka ihe ọ bụla maa mma n’oge kwesịrị ekwesị.+ O medịrị ka ịdị ndụ ebighị ebi na-agụ ndị mmadụ agụụ.* Ma ha emekataghị chọpụta ọrụ ezi Chineke rụrụ malite n’isi ruo ná ngwụcha.
12 Aghọtala m na e nweghị ihe dị mma ha ga-eme karịa ịna-enwe obi ụtọ na ịna-eme ihe ọma n’oge ha dị ndụ+ 13 nakwa ka onye ọ bụla na-eri ihe, na-aṅụ mmanya ma na-enwe obi ụtọ n’ihi ọrụ niile ọ na-arụsi ike. Ọ bụ onyinye Chineke.+
14 Amatala m na ihe niile ezi Chineke na-eme ga-adịru mgbe ebighị ebi. E nweghị ihe mmadụ ga-etinye ma ọ bụ wepụ na ya. Ezi Chineke emeela ka ihe niile dịrị otú a, ka ndị mmadụ wee na-atụ egwu ya.+
15 Ihe ọ bụla merenụ emebuola, ihe ka ga-adị adịbuokwala.+ Ma ezi Chineke ga-eme ihe ndị mmadụ na-agbasi mbọ ike ka ha mee.*
16 Ahụkwala m ihe a n’ụwa:* Ajọ omume anọchiela ikpe ziri ezi, ajọ omume anọchiekwala ezi omume.+ 17 M wee kwuo n’obi m, sị: “Ezi Chineke ga-ekpe ma onye ezi omume ma onye ajọ omume ikpe,+ n’ihi na ihe ọ bụla a na-eme eme na ọrụ ọ bụla a na-arụ arụ nwere oge.”
18 M kwukwara n’obi m banyere ụmụ mmadụ, sị: Ezi Chineke ga-anwale ha, gosikwa ha na ha dị ka anụmanụ. 19 N’ihi na ọ bụ ihe na-eme* mmadụ na-emekwa anụmanụ. Otu ihe ahụ na-eme ha niile.+ Otú anụmanụ si anwụ ka mmadụ si anwụ. Ọ bụ otu ume ndụ ka ha niile na-eku.+ N’ihi ya, e nweghị ihe mmadụ ji kara anụmanụ, n’ihi na ihe niile bụ ihe efu. 20 Ha niile na-aga n’otu ebe.+ Ha niile si n’ájá,+ ha niile na-alaghachikwa n’ájá.+ 21 Ònye ma ma ume ndụ mmadụ ọ̀ na-agbago elu? Ònyekwa ma ma ume ndụ anụmanụ ọ̀ na-agbada n’ala?+ 22 M wee hụ na e nweghị ihe dị mma mmadụ ga-eme karịa inwe obi ụtọ+ n’ihi ọrụ ọ na-arụ maka na ọ bụ ya bụ ụgwọ ọrụ ya;* n’ihi na e nweghị onye nwere ike ime ka ọ hụ ihe ga-eme mgbe ọ na-anọghịzi.+